Sunday, November 7, 2010

Maazị Gordon Campbell na-agbazị arụkwaghị m

November 3, 2010: Maazị Gordon Campbell na-agbazị arụkwaghị m

Onye ji ọkwa premịa nke prọvịnsụ British Colombia na Canada, bụ maazị Gordon Campbell, na-agbazị arụkwaghị m. Maazị Campbell kpọrọ otu pati ya bụ liberal pati n’ụtụtụ Wenezdee ka ha hazie nzukọ maka ịhọpụta onye ọzọ ga-achịwazị otu ahụ.

Campbell weere oche dịka onye ndu otu liberal pati na British Colombia n’afọ iri na asaa gara aga. E mechera họpụta ya dịka onye premịa nke prọvịnsụ ahụ n’abalị ise nke ọnwa June n’afọ puku abụọ na otu.

N’ọnwa Julay nke afọ a, Campbell na ndị omebe iwu nke otu pati ya tinyere iwu ọhụrụ metụtara ịna ndị mmadụ ụtụ isi mgbe ọbụla ha na-ego ihe. Iwu ọhụrụ a, bụ nke nyere ọtụtụ ndị mmadụ obi ọjọọ, mere ka ọchịchị maazị Campbell si n’ihu n’azụ n’enwete aka mgba. A na-anụ kepu kepu na ụfọdụ ndi otu pati ya si na nzozo n’agwa ya ka Ọ rịtuo n’ọchịchị.

E nweghị onye ma mgbe ndị liberal pati ga-ahazi ọgbakọ a. Mana maazị Campbell ga-ejido ọkwa ya ruo mgbe ọbụla ndị pati ya họpụtara onye ndu ọhụrụ.

Dr Chidi N Igwe
Correspondent
Voice of Nigeria (Lagos)